Isaiah 59

Mmehie, ikwupụta mmehie, na mgbapụta

1Nʼezie, aka Onyenwe anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta,
ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe.
2Kama mmehie unu ekewapụla unu
site nʼebe Chineke unu nọ;
mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ,
nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ.
3Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara,
mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ.
Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha,
ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ.
4Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi,
ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe.
Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha,
ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe.
5Ha na-avụ akwa ajụala,
na-akpakwa akwụ udide.
Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ,
mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta.
6Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe,
ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha.
Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ,
omume ihe ike jupụtara ha nʼaka.
7Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie,
ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere.
Ha na-achụso echiche ajọ ihe,
ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile.
8Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ,
ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso.
Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ.
Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo.

9Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ,
ezi omume adịghị erute anyị nso.
Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ.
Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.
10Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya,
na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya;
anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji,
nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ.
11Anyị na-agbọ ụja dịka bịa;
anyị na-akwasị akwa ike dịka nduru nʼeru ụjụ.
Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị eru anyị aka;
anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya nʼebe anyị nọ.

12Nʼihi na mmehie anyị amụbaala nʼihu Onyenwe anyị;
ọ na-agbakwa ama megide anyị.
E, anyị makwaara ụdị ndị mmehie anyị bụ,
nʼihi na mmehie anyị dịkwa nʼihu anyị mgbe niile.
13Anyị maara nnupu isi anyị na ngọnarị anyị gọnarịrị Onyenwe anyị;
anyị esitela nʼiso Onyenwe anyị Chineke anyị wezuga onwe anyị,
nọgide na-akpali mmegbu na nnupu isi.
Okwu ọnụ anyị bụ okwu ụgha, nke anyị si nʼobi anyị tụpụta.
14Ụlọ ikpe anyị niile adịghị achọ onye ezi omume;
anyị amaghị ihe a na-akpọ ikpe ziri ezi.
Eziokwu asọọla ngọngọ nʼama niile,
ihe ziri ezi apụghị ịbata.
15E, eziokwu alaala;
onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu.

Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ;
ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị.
16Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla;
o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ.
Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya,
bịa ịzọpụta anyị.
17Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya.
Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya.
Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo
na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya.
18Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya
dịka ajọ omume ha niile si dị.
Iwe ọkụ ya
ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile
bi na mba dị anya.
19Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha Onyenwe anyị,
sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya.
Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmiri
nke nkume, Onyenwe anyị na-agba na-aga.
Maọbụ, mgbe onye iro ga-abata dịka idee mmiri, mmụọ nke Onyenwe anyị ga-ebuli ọkọlọtọ imegide ya.


20“Onye mgbapụta ga-abịa na Zayọn;
ọ ga-abịakwute ụmụ Jekọb ndị na-esite na mmehie ha chegharịa.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
21“Ma mụ onwe m, nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Mmụọ m, nke dị nʼahụ gị, na okwu m niile nke m tinyere nʼọnụ gị, agaghị apụ nʼegbugbere ọnụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ ụmụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ agbụrụ gị. Ha ga-adịgide site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi,” ka Onyenwe anyị kwuru.

Copyright information for IboBIU